Anụ Gbaa Ajọ Egbe (Synopsis in Igbo)

Bụrụ otu n'ime ndị mbụ ga-agụ akwụkwọ a kpọrọ titọ Anụ Gbaa Ajọ Egbe

Anụ Gbaa Ajọ Egbe

img_20190527_143710_6552808352430232663185.jpg

Ndị mmadụ sị na ejula esighị ike mana e mee ha esi n’azụ na-ejide ya. Ha ghaa ịgharakpatamkpa na ịgharakịghara, ha ebodo ya Mbe. Mbe sị na e bo ya ji na aja, o bo ya agwụ ya, maka na ka mkpara na-akụ ọkpọkọrọ, ka ọkpọkọrọ na-akụ mkpara. Ụkwụ akaekpe ịkpọ onye ọbụla n’okwute na mmalite ihe ọbụla abụghị ezigbo ihe. Ọ bụ akara n’ụzọ adịghị ebe a na-aga, maọbụ na mkpụrụ agaghị adị n’ụkwa a chọrọ ịpị. Ma Mbe sị na ọ kpọọ ya n’ụkwụ aka ekpe, o kegharịa ikpe, jiri ụkwụ ya, kpọọ onwe ya n’ụkwụ aka nri!

Bịa ka ị hụrụ.

Maka Odee

Anụ Gbaa Ajọ Egbe… bụ iduaazị (Novel) Igbo nke abụọ Ositadịmma Nzudịnobieze Amakeze deerela. A gụọla nke mbụ bụ Ọgazị Amakan’ọtụtụ ụlọakwukwo dịka na College of Education Ụmụnze. Mgbe adịghị anya, Abụ (poetry) o ji Igbo wee kpụ ka ụzụ kpụrụ ogene ga-apụtakwa. Ọ bụ ya dere Teeth of the Snailnke Mahadum Nnamdi Azikiwe dị na Ọka gụọrọla. The Last Carver,Medley of The Musena ọtụtụ ndị ọzọ si n’ọgụgụ isi ya kpọsa ma na-erekwa ka akara ọkụ n’ahịa akwụkwọamazon.com. Ọ bụ ya hiwere otu nkanaụzụ a kpọrọ Young Women & Men Creative Associationnke ị ga-eji akara #TeamYowamcawere sokwuru na ngịga-ụwa (Internet). Ositadimma etutela ọtụtụ Ugo tinyere ÓMÓ Ambassador Award nakwa DICIDE Smart Ambassador Award nke e tunyere ya na United Nations Headquarters, nke dị na mba America. Ọ bụ onye Nimo nke dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Njikọka, Anambra Steet, Naịjiria, bụrụkwa ụkọchukwu nke ụka Katọlik na dayọsis nke Ọka.

Pịa ebe a iji nweta akwụkwọ nke gị. Dejupụta akwụkwọ a mgbe ị kwụrụ ụgwọ ka anyị wee kpọtụrụ gị.




One comment

Leave a Reply

Fill in your details below or click an icon to log in:

WordPress.com Logo

You are commenting using your WordPress.com account. Log Out /  Change )

Google photo

You are commenting using your Google account. Log Out /  Change )

Twitter picture

You are commenting using your Twitter account. Log Out /  Change )

Facebook photo

You are commenting using your Facebook account. Log Out /  Change )

Connecting to %s

This site uses Akismet to reduce spam. Learn how your comment data is processed.